Gbetu TV (News They Are Not Talking About)
Health & Relationship

Ihe ndi g’eme ma ọbụru na nnukwu ọria virusụ anaa abụghị ihe ndi mmadụ ga eleghara anya.

ọria mmadụ: Igbala okwụ asi ọsọ, ngalaba nile nke ụwa ka ajọ ọria a n’efe efe jidere tiwasia ya ka ụdụ eji echụ mmiri, ọria a akpọrọ covid 19 abụgoro ọghọm nyere ngalaba di iche iche na ahụ maka ñchekwa na agamniru ndu mmadụ. ñgalaba ñdia gunyere ngalaba agụmu akwụkwọ, ngalaba nke n’ahu maka ego, galaba ụka na kwa ngalaba ọru ụgbo na ngalaba ndi ọzọ ga. Dika onye ọrụ ụgbo mgbe ọbụna ñtughariri uche na ọnọdụ ndi bidoro ọrụ ụgbo ọhuru n’oge a, anam eñwe ñnukwu obi ñwute. Ihe otiti a biara ụwa nile na mberede.


Ka ọ di ụgbua ọdika ọria a ana ebenata na obodo ndi ọzọ di na ụwa, mana na obodo anyi bụ Nigeria na obodo ndi ọzọ di na mba Africa, ọria a ka na amụba ka aja di ala kwa ụbọchi.

 

Edemede a abụghi iji kpalite obi ebere na aka ndi mmadụ kama nọ iji were kọwaa ahụmahụ nna ahụ n’oge a dika onye ọrụ ụgbo ma kabakwa ahụ fụụ na edepụtaram nwa obele ụsoro ndi ọru ụgbo ibem ga elegara anya ma nnogidesie ike na ọru a na oge a karisia ndi nke malitere ọru a ọhụrụ.

 

Ubọchi taata mere ya ñnọ otu ọnwa anyi nwere ọkukọ nari ise nke n’ada bido na kilogramu abụa were rue na nke abụa na ọkara, anyi nwekwala ñnụkwụ olile anya na anyi ga eleta ñnụkwụ ego n’oge isita, mana olile anya ahụ bu nke dara mmiri.


Anyi bidoziri rioba ndi nri na restọranti ka ha bia goro anyi ọkukọ anyi na aka emechaa ha ewetara anyi ego na ọnu #900/kg, mana mbọ ñdia nile anyi gbara iji repụ ya bu ọkukọ amighi mkpụrụ. Nke meziri ka anyi wetụte aka na ñri anyi na enye ụmụ ọkụkọ a, kwuzikwa inye ha umu ọgwu ndi kwesiri ka enye ha iji wee wetụte aka na ego ejizupute ọkukọ ndia.

 

Atumaatu ibute ọkukọ ga anọchi ndia ma eresia ha bụzi ihe malụ afọ na ala, ọtutụ ndi ọru ụgbo ibe m emechie la nihị na ndi mmadụ anaghizi ego ọkukọ etu okwesiri, a si na onye ulọ ya na agba ọkụ adighi achụ oke. Ka o sila di, na ụbochi taata, anyi jịsike ree nani iri isii kwa centum ya bụ 60 pasent na ọnu na erughi ego eji zuputa umu ọkukọ a, ọkukọ ndi nwụrụ anwụ rụrụ pasent iri na ise, anyi nyekwala ndi mmadụ pasent iri na akwụghi ụgwọ, hapụzie ndi fọdụrunu ka jiri aka ha chụtaba ọnụ ha.

 

Ezinụlọ ndi na egochabụ ọkukọ ise na oge gara aga na egozi nani abụa, ndi na egotebu abụa na egotezi nani otu.


Ụfọdu jizi fecha fecha ọkukọ igbo anyi nke na enweghi ñnụkwụ anu were mee emume mbilite na onwu Kraisti nke akpọrọ ista.

 

Otụ nime ndi neme ka ahia ọkukọ na aga nke oma bu ụka mechiri emechi maka ajọ ọria a. Ọria Covid 19 emena nke ndi mmadụ wepụ anya na izụta anyi ọkukọ na oge a, ụfọdi ndi aka esichabeghi ike na ahia na echezi uche ikwụsi kpam kpam.

 

Dika onye gabigala ihe ndia nile ọ ga amasi mụ itụnye ihe ndi ole na ole iji wee kwalite mmụọọ ndi ọru ụgbo na azụ ọkukọ site idepụte ihe ndi mchere na ọ ga enyere ha aka na oge a ya na etụ mchere ha ga esi bidokwa ọzọ mgbe ọria nala.

Ihe ndi g’eme ma ọbụru na nnukwu ọria virusụ anaa abụghị ihe ndi mmadụ ga eleghara anya.

a). Tupụ onye ọbuna na azụ ọkụkọ atụba atumaatu ibute umu okuko ọhuru, ọ ga agba mbọ bụru ụzọ mara ka ahia ọkụkọ siri gbata ma kwụrụ tupụ ogotebe ọzọ. ya ejina maka na ahia ndi ọzupụtara na oge gara aga dịmma ga bụte ọzọ ka ndi ọzụbụru na ọnu ọgụ maka na ụfọdu ezi na ulọ ga ewetụnata aka na ụdi ha si emefụ ego ha na oge a .


b)Ụfọdu ihe ñrita nke ndi gọọmenti nakwa ndi mmadụ ọzọ na eji akwalite mmụọọ ndi ọrụ ụgbo adighi erụte ụfọdu aka maka na ha erụghi ikete oke na ya, na ihị na ha edebeghi aha ụgbo ha ka osiri kwesi. ya mere ndi di otụ a kwesiri idi nkwadobe ka rapụ ibu ndi ga enwete afo ojụ ojụ mgbe nke a mere.

 

ch). onye ọbuna na azu ọkụkọ kwesiri ima mgbe di mma o kwesiri iji nye ọkụkọ ya ọgwu na ihe ndi ọzọ na akwalite ahụ ike ọkụkọ

 

d). oge na mgbe so na ihe di ñnukwụ mba na ọru ụgbo, onye ọru ụgbo obuna kwesiri ima mgbe, ebee , na ụdi ọ chọrọ isi zupụta ọkukọ ya iji wee rite ụru na ya.

 

e). onye ọru ụgbo ọbuna kwesiri igba ñbọ hụụ na ọkpọketere ndi na azụ gi ahia ñso ka o were mara ọdi ahia ha chọrọ ma nyekwa ha ya.


Enwerem olileanya na ihe ndia ga enyere anyi aka, ọ bụ ezie na atụmaatụ ndi ọkacha mara nwere ike idi iche na nkem, biko anam atu anya na gi onwe gi na agụ edemede a ga atụnye uche gi nakwa ka o si di gi na obi na okwụ a.

 

Ọ bụ ebụmobi m ihụụ na mbunobi nke ndi na ahu maka nkwalite ñdu ndi mmadu bụ Sustainable development goals (mdgs) n’onụ bekee

bụ nke anyi ga enwete na oge adighi anya.

 

Abụm nwa amadi.

 

Ernest Onyedikachi Maxwell

MASTERPIECE from IGBO WRITER

MASTERPIECE from IGBO WRITER

__________________________ Join us on WhatsApp ______________________________
Tags: Ernest Onyedikachi Maxwell Igbo
FADAKA LOUIS

Recent Posts

  • Education

JAMB set to release 2024 UTME results

The Joint Admissions and Matriculation Board (JAMB) has concluded plans to release the results of the 2024 Unified Tertiary Matriculation…

29 April 2024
  • Health

Why drinking cold water is dangerous, even in hot weather

Cardiologists and public health physicians have warned Nigerians against excessive consumption of cold water, stressing that it can lead to…

29 April 2024
  • Technology

China’s robotic spacecraft to be sent to the moon

The Chang’e 6, China’s next robotic spacecraft to the moon, has been scheduled to set out on its journey in…

29 April 2024
  • Education

Lagos Indian school where Nigerians are denied admission

Gbenga Oloniniran writes about the discrimination experienced by some Nigerians on the premises of foreign businesses where they are met…

29 April 2024
  • Technology

NASA is officially headed to Saturn moon

It's scientifically ambitious. It's aeronautically daring. And it's unflinchingly expensive. It's NASA's newly approved mission to Saturn's moon, Titan, where…

29 April 2024
  • Politics

Mali: Political parties call for presidential elections to end military transition

Since the coup d’état on May 24, 2021, a transition government has been in charge of Mali and shows no…

29 April 2024